John 19:31 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma ndị Juu achọghị ka ahụ ndị a a kpọgidere nꞌobe nọgide nꞌebe ahụ tutuu chi abọọ. Nꞌihi na echi ya bụ ụbọchị izuike. Ha jekwuru Pailet rịọ ya ka ọ gwa ndị agha ya ka ha gbajisịa ụkwụ ha. Nke a bụ nꞌihi na ha chọrọ ka ndị a nwụọ ọsịịsọ. Ọzọ kwa, nꞌihi na ha chọkwara ibupụ ahụ ha.
Igbo 2006
Ya mere ndi-Ju, ebe ọ bu ubọchi Nkwadebe, ka aru-ha we ghara idigide n'elu obe n'ubọchi-izu-ike (n'ihi na ubọchi-izu-ike nke ízù ahu bu oké ubọchi), ha kpere Pailat ka etijie ogwe-ukwu-ha, ka ebupu kwa ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ndị Juu achọghị ka ahụ ndị ahụ a kpọgidere nʼobe nọgide nʼebe ahụ ka chi bọọ, nʼihi na ọ bụ Ụbọchị Nkwadebe. Echi ya bụ ga-abụ ụbọchị izuike pụrụ iche. Ha rịọọrọ Pailet ka a gbajisie ha ụkwụ ma bupụkwa ahụ ha.