John 19:38 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ihe ndị a gasịrị, otu nwoke na-eso ụzọ Jisọs na nzuzo a na-akpọ Josef, onye si nꞌobodo a na-akpọ Arimatia, jekwuuru Pailet, rịọ ya ka o nye ya ike ibutu ozu Jisọs. Pailet nyere ya ike. Josef gara butuo ozu Jisọs.
Igbo 2006
Ma mb͕e ihe ndia gasiri, Josef nke Arimatia, ebe o nēso uzọ Jisus, ma na nzuzo n'ihi egwu ndi-Ju, o kpere Pailat ka o bupu aru Jisus: Pailat we kwere ya. Ya mere ọ biara, bupu aru-Ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ihe ndị a gasịrị, otu nwoke aha ya bụ Josef, onye sitere Arimatia, onye na-eso ụzọ Jisọs na nzuzo, nʼihi egwu ndị Juu, jekwuuru Pailet rịọ ka o nye ya ikike iburu ahụ Jisọs, Pailet kwere, ya mere ọ bịara buru ahụ ya.