John 19:42 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌime ili a ka ha dọnyere ozu Jisọs, nꞌihi na ili a dị nso. Ọzọ kwa, Nikọdimọs na Josef na-eme ngwangwa nꞌihi na ha chọrọ imechasị ihe nile tupuu ụbọchị izuike ebido. Nꞌihi na ụbọchị izuike ndị Juu na-ebido nꞌelekere isii nke abalị ụbọchị ahụ.
Igbo 2006
Ya mere n'ebe ahu, n'ihi ubọchi Nkwadebe nke ndi-Ju, (n'ihi na ílì ahu di nso), ka ha tọb͕ọrọ Jisus.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na ọ bụ ụbọchị Nkwadebe nke ndị Juu, nakwa nʼihi na ili ahụ dị nso, ha dọnyere ahụ Jisọs nʼime ya.