John 19:6 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ndị isi ndị Juu hụrụ Jisọs, ha bidoro iti mkpu na-asị, “Kpọgide ya nꞌobe! Kpọgide ya nꞌobe!” Pailet zara sị ha, “Kpọrọnụ ya gaa kpọgide ya nꞌonwe unu. Achọpụtaghị m ihe ọjọọ ọ bụla nꞌime ya.”
Igbo 2006
Ya mere mb͕e ndi-isi-nchu-àjà na ndi nēje ozi huru Ya, ha tie nkpu, si, Kpọgide Ya n'obe, kpọgide Ya n'obe. Pailat si ha, Unu onwe-unu were Ya, kpọgide kwa Ya n'obe: n'ihi na mu onwem ahughi ihe kwesiri ahuhu-nmhie nime Ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ngwangwa, ndịisi nchụaja na ndị nche hụrụ ya, ha tiri mkpu sị, “Kpọgide ya nʼobe! Kpọgide ya nʼobe!” Pailet sịrị ha, “Kpọrọnụ ya kpọgbuo ya nʼonwe unu. Achọpụtaghị m ihe ọjọọ ọbụla o mere.”