John 2:12 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe oriri ọlụlụ nwụnye ahụ gwụsịrị, Jisọs hapụrụ obodo Kena gaa nꞌobodo Kapanọm, ya na nne ya na ụmụnne ya. Ndị na-eso ụzọ ya sokwa ya gaa. Ya na ha nọrọ na Kapanọm ụbọchị ole na ole.
Igbo 2006
Mb͕e ihe a gasiri Ọ ridara na Kapanaum, Ya onwe-ya, na nne-Ya, na umu-nne-Ya, na ndi nēso uzọ-Ya: ha we nọgide n'ebe ahu ọ bughi ọtutu ubọchi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe nke a gasịrị, ọ gara Kapanọm, ya na nne ya na ụmụnne ya, nakwa ndị na-eso ụzọ ya. Ha nọrọ ụbọchị ole na ole nʼebe ahụ.