John 2:22 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị okwu a. Ma mgbe e mere ka Jisọs site nꞌonwụ bilie, okwu a doro ha anya. Mgbe ahụ kwa, ha kweere nꞌakwụkwọ nsọ, na okwu nile Jisọs gwara ha.
Igbo 2006
Ya mere mb͕e emere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, ndi nēso uzọ-Ya chetara na O kwuru okwu a; ha we kwere ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, ya na okwu Jisus kwuru.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị na-eso ụzọ ya chetara okwu ya a mgbe o siri nʼọnwụ bilie. Mgbe ahụkwa, ha kweere akwụkwọ nsọ ya na okwu niile Jisọs kwuru.