John 2:6 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌụlọ ahụ ha nọ, a dọbara ite mmiri isii buru ibu. Otu nꞌime ite ndị a na-eri ihe dị ka iri lita mmiri ạnọ. Nꞌime ite a ka ndị Juu na-agbanye mmiri ha ji asa ụkwụ ha, na aka ha, na ihu ha, tupuu ha ekpee ekpere.
Igbo 2006
Ma adọbara n'ebe ahu ite nkume miri isi, dika ime-ọcha nke ndi-Ju si di, nānagide firkin abua ma-ọbu atọ n'otù.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
A dọbara ite mmiri nkume isii buru ibu nʼakụkụ ebe ahụ, nke a na-eji agbanye mmiri ndị Juu na-eji asachasị onwe ha ma ha chọọ ikpe ekpere. Otu nʼime ha na-eri ihe dị ka galọọnụ iri abụọ ma ihe ruru iri atọ.