John 2:9 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe onyeisi oche ahụ detụrụ mmiri ahụ e mere ka ọ ghọọ mmanya ọnụ, (ma ọ maghị ebe o si pụta nanị ndị na-eje ozi maara), ọ kpọrọ di nwanyị ọhụrụ ahụ sị ya, “Nꞌoge mmemme ọ bụla, a na-eburu ụzọ nye mmanya dị ụtọ. Mgbe ndị mmadụ ṅụjuchara afọ, ruo na mgbe ‘Kama mmanya dọrọ nꞌite ka ọ dọrọ nꞌafọ,’ e bido na-ebupụta mmanya na-adịghị ụtọ. Ma i meghị nke a! I debere mmanya ọma a ruo ugbu a.”
Igbo 2006
Ma mb͕e onye-isi oriri ahu deturu miri ahu ọnu nke ghọrọri manya-vine, ma ọ mataghi ebe o si puta (ma ndi nēje ozi ndi kuputarari miri ahu mara), onye-isi oriri ahu we kpọ onye nālu nwunye ọhu,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ onyeisi oche ahụ detụrụ mmiri ahụ e mere ka ọ ghọọ mmanya ọnụ. Ọ mataghị ebe o siri pụta (ma ndị na-eje ozi, ndị kutere mmiri ahụ matara), onyeisi oche ahụ kpọpụtara onye ahụ na-alụ nwunye ọhụrụ iche