John 20:1 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌisi ụtụtụ ụbọchị mbụ nke izu ụka, mgbe chi na-abọzibeghị, Meri Magdalin bịara nꞌili ebe e liri Jisọs, hụ na e nupụla nkume ahụ e ji mechie ọnụ ili ahụ.
Igbo 2006
Ma n'ubọchi mbu nke ízù ubọchi asa n'isi-ututu, mb͕e chi akābọghi, Meri Magdalini biaruru ílì ahu, we hu nkume-ya na ewepuwo ya n'ílì.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼisi ụtụtụ ụbọchị mbụ nke izu ụka, mgbe chi na-abọzibeghị nke ọma, Meri Magdalin bịara nʼili ahụ, ma hụ na e wepụla nkume ahụ e jiri mechie ọnụ ili ahụ.