John 20:15 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Jisọs jụrụ Meri ajụjụ sị, “Gịnị mere i ji akwa akwa? Onye ka ị naachọ?” Ebe Meri chere na Jisọs bụ onye na-elekọta ogige ahụ, Meri zara sị ya, “Biko, ọ bụrụ na ọ bụ gị bupụrụ Onyenwe m, gwa m. Gosi m ebe i debere ya ka m gaa buru ya.”
Igbo 2006
Jisus si ya, Nwanyi, gini mere i nākwa ákwá? ònye ka i nāchọ? Nwanyi ahu, ebe ọ nēchè na Ọ bu onye-nche ubi ahu ab͕ara ogige, ọ si Ya, Onye-nwe-ayi, ọ buru na Gi onwe-gi bupuru Ya, gwam ebe I tọb͕ọrọ Ya, mu onwem gēbupu kwa ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jisọs sịrị ya, “Nwanyị, gịnị mere iji ebe akwa? Onye ka ị na-achọ?” Ebe o chere na ọ bụ onye na-elekọta ogige ahụ, ọ sịrị ya, “Nna anyị ukwu, ọ bụrụ na ọ bụ gị bupụrụ ya, gwa m ebe i debere ya ka m gaa buru ya.”