John 20:19 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌanyasị ụbọchị ahụ ndị na-eso ụzọ Jisọs zukọtara nọdụ nꞌime otu ụlọ. Ha mechiri ụzọ nile e si abata nꞌụlọ ahụ nꞌihi na ha na-atụ egwu ihe ndị isi ndị Juu ga-eme ha. Ma na mberede, mgbe ha na-atụghị anya ya, Jisọs batara guzo nꞌetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu!”
Igbo 2006
Ya mere mb͕e o ruru anyasi, n'ubọchi ahu, bú ubọchi mbu n'ízù, mb͕e emechi-kwa-ra uzọ nile ebe ndi nēso uzọ-Ya nọ, n'ihi egwu ndi-Ju, Jisus biara guzo n'etiti, si ha, Udo diri unu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼuhuruchi nke ụbọchị ahụ, bụ ụbọchị mbụ nke izu ụka, mgbe ndị na-eso ụzọ ya zukọtara nʼime otu ụlọ. Ha mechiri ụzọ niile nʼihi egwu ndị Juu. Jisọs batara guzo nʼetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu!”