John 20:2 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ laghachiri azụ chọta Saimọn Pita na Jọn gwa ha sị, “Ha esitela nꞌime ili ahụ bupụ Onyenwe anyị. Amaghị m ebe ha bujere ha.”
Igbo 2006
Ya mere ọ b͕a ọsọ, biakute Saimon Pita, biakute kwa onye ọzọ ahu nēso uzọ Jisus, onye Jisus huru n'anya, si ha, Ha ebupuwo Onye-nwe-ayi n'ílì, ayi amataghi kwa ebe ha tọb͕orọ Ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
O ji ọsọ bịakwute Saimọn Pita na onye ọzọ ahụ nke na-eso ụzọ ya, bụ onye Jisọs hụrụ nʼanya sị, “Ha esitela nʼili ahụ bupụ Onyenwe anyị. Anyị amaghị ebe ha dobere ya!”