John 20:25 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ndị ọzọ gwara ya na ha ahụla Jisọs, o kweghị. Ọ sịrị, “Ọ bụ nanị mgbe m jiri anya m hụ ebe ntu kpọpuru ya aka. Ọ bụ nanị mgbe m tinyere aka m nꞌapa ntu ndị a, ọ bụkwa nanị mgbe m tinyere aka m nꞌakụkụ ya ebe a mara ya ùbe, ka m ga-ekwere na o sitela nꞌọnwụ bilie.”
Igbo 2006
Ya mere ndi ọzọ nēso uzọ Jisus si ya, Ayi ahuwo Onye-nwe-ayi. Ma ọ siri ha, Ọ buru na ahughm n'aka-Ya abua apa ǹtú, tiye kwa nkpisi-akam n'apa ǹtú ahu, tiye kwa akam n'akuku-Ya, m'gaghi-ekwe ma-ọli.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, ndị ọzọ na-eso ụzọ ya gwara ya, “Anyị ahụla Onyenwe anyị!” Ma ọ sịrị ha, “Ọ bụ naanị mgbe m jiri anya m hụ ebe ahụ ntu kpọpuru ya aka, tinye mkpịsịaka m nʼapa ntu ndị ahụ, ma tinyekwa aka m nʼakụkụ ya ebe ahụ a mara ya ùbe, ka m ga-ekwere.”