John 21:11 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Saịmọn Pita pụrụ gaa dọgota ụgbụ azụ ahụ nꞌelu ala. Ila dị narị azụ abụọ na iri ise na atọ nꞌime ụgbọ ahụ. Ma ụgbụ ahụ adọwaghị!
Igbo 2006
Ya mere Saimon Pita rigoro, dọrọ ihe ha ji eb͕u azù bia n'ala, nke oké azù juru nime ya, ọgu azù asa na iri na atọ: ma ọ bu ezie na azù di ọtutu otú a, ma ihe ha ji eb͕u azù adọkaghi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Saimọn Pita pụrụ gaa dọgota ụgbụ azụ ahụ nʼelu ala. Ihe juru ya bụ azụ ndị ukwuu nke ọnụọgụgụ ya dị narị na iri ise na atọ. Ma ụgbụ ahụ adọwaghị nʼagbanyeghị na azụ juru nʼime ya.