John 21:15 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ha risịrị nri, Jisọs kpọrọ Saịmọn Pita jụọ ya sị, “Saịmọn nwa Jọn, ị hụrụ m nꞌanya karịa ndị a nile?” Pita zara sị ya, “Ee Onyenwe m, ị maara na m hụrụ gị nꞌanya.” Jisọs sịrị ya, “Lekọtaa atụrụ m.”
Igbo 2006
Ya mere mb͕e ha risiri nri-ututu-ha, Jisus si Saimon Pita, Saimon, nwa Jọn, ì hurum n'anya kari ndia? Ọ si Ya, E, Onye-nwe-ayi; Gi onwe-gi matara na I bu eyìm. Ọ si ya, Nēnye umu-aturum nri.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ha risiri nri ụtụtụ, Jisọs sịrị Saimọn Pita, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya karịa ndị a niile?” Ọ sịrị ya, “E, Onyenwe anyị, ị maara na m hụrụ gị nʼanya.” Jisọs sịrị ya, “Na-azụ ụmụ atụrụ m.”