John 21:18 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌezie asị m gị, na mgbe ị bụ okorọbịa i mere ihe dị gị mma nꞌanya. Ị gara ebe ị chọrọ ịga. Ma mgbe ị ghọrọ agadi ị ga-esite aka gị, mgbe ndị ọzọ ga-edu gị. Ha ga-edu gị gaa ebe ị na-achọghị ịga.”
Igbo 2006
N'ezie, n'ezie, asim i, Mb͕e i di n'okorọbia, i nēke onwe-gi ihe-ọkiké n'úkwù, nējeghari kwa ebe i nāchọ: ma mb͕e i gēme agadi, i gēseti aka-gi abua, onye ọzọ gēke gi ihe-ọkiké n'úkwù, būru kwa gi ga ebe i nāchọghi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼezie, nʼezie asị m gị, mgbe ị bụ okorobịa ị na-eke ajị nʼukwu, gaa ebe ị chọrọ ịga. Ma mgbe ị ghọrọ agadi, ị ga-esetipụ aka gị, onye ọzọ ga-ekee gị ihe okike nʼukwu ma duru gị gaa ebe ị na-achọghị ịga.”