John 21:2 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ụfọdụ nꞌime ndị na-eso ụzọ ya nọkọrọ otu ebe. Ndị a bụ Saịmọn Pita na Tọmọs onye a na-akpọ Didimọs, na Jemes, na Jọn, ụmụ Zebedi, na mmadụ abụọ ndị ọzọ bụkwa ndị ozi ya.
Igbo 2006
Saimon Pita, na Tomas anākpọ Didimọs, na Nataniel, bú onye Kena nke Galili, na umu nke Zebedi, na madu abua ọzọ nime ndi nēso uzọ-Ya, nọkọrọ n'otù ebe.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ụfọdụ nʼime ndị na-eso ụzọ ya nọkọrọ otu ebe. Ndị a bụ Saimọn Pita na Tọmọs (onye a na-akpọ Didimọs), na Nataniel, onye Kena nke Galili na ụmụ Zebedi, na mmadụ abụọ ndị ọzọ bụkwa ndị ozi ya.