John 21:20 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Pita chigharịrị hụ onyeozi ahụ naadabere nꞌobi Jisọs ka ọ na-esokwa ha nꞌazụ. Ọ bụ onyeozi ahụ jụrụ Jisọs ajụjụ banyere onye nꞌime ha ga-arara ya nye.
Igbo 2006
Pita we chigharia, hu onye ahu nke nēso uzọ-Ya, onye Jisus huru n'anya, ka o nēso; onye nādabere kwa n'obi-Ya na nri-anyasi ahu, si, Onye-nwe-ayi, ònye bu onye ahu nke nārara Gi nye?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Pita chigharịrị hụ onye ahụ na-eso ụzọ ya nke Jisọs hụrụ nʼanya ka ọ na-esokwa ha nʼazụ. (Ọ bụ onyeozi ahụ dabeere ya nʼobi na nri anyasị, nke sịrị, “Onyenwe anyị, onye ga-arara gị nye?”)