John 21:23 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ndị ozi Jisọs kwuritara nꞌetiti onwe ha si na onyeozi a agaghị anwụ anwụ. Ma nke a abụghị ihe Jisọs kwuru. Nanị ihe o kwuru bụ, “Ọ bụrụ na m achọọ ka ọ dị ndụ tutuu ruo mgbe m ga-alọghachi gịnị ka nke a bụụrụ gị?”
Igbo 2006
Ya mere okwu a putara n'etiti umu-nna nime Kraist, na onye ahu nke nēso uzọ-Ya agaghi-anwu: ma Jisus asighi ya, na ọ gaghi-anwu; kama, Ọ buru na anamachọ ka ọ nọgide rue mb͕e M'gābia, ọ̀ bu gini n'ebe i nọ?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, akụkọ a gbasara nʼetiti ụmụnna na onye a na-eso ụzọ ya agaghị anwụ. Ma Jisọs asịghị ya na ọ gaghị anwụ anwụ, kama, “Ọ bụrụ na m chọrọ ka ọ nọgide ruo mgbe m ga-abịa, ọ gbasara gị?”