John 21:6 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ gwara ha sị, “Tụnyenụ ụgbụ unu nꞌakụkụ aka nri ụgbọ unu. Unu gaegbutekwa ọtụtụ azụ.” Ha tụnyere ụgbụ ha, ma ha enwekwaghị ike ịdọpụta ya nꞌihi na ọtụtụ azụ dị nꞌime ya, nke mere ka ụgbụ ahụ dị arọ nke ukwuu.
Igbo 2006
O we si ha, Wuyenu ihe unu ji eb͕u azù n'akuku aka-nri nke ub͕ọ, unu gāhu kwa. Ya mere ha wuyere ya, ma ub͕u a ha enweghi ike idọ ya n'ihi ọtutu azù di ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ gwara ha, “Wụnyenụ ụgbụ unu nʼakụkụ aka nri nke ụgbọ. Unu ga-egbutekwa azụ.” Mgbe ha mere nke a, ha enwekwaghị ike ịdọpụta ụgbụ ha, nʼihi ọtụtụ azụ nke dị nʼime ya.