John 21:7 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ahụ Jọn gwara Pita sị, “Ọ bụ Onyenwe anyị!” Ngwangwa Saịmọn Pita yiiri uwe ya (nꞌihi na ọ gba ọtọ), wụba nꞌime mmiri gwuru mmiri pụọ gaa nꞌelu ala.
Igbo 2006
Ya mere onye ahu nke nēso uzọ-Ya onye Jisus huru n'anya siri Pita, Ọ bu Onye-nwe-ayi. Ya mere mb͕e Saimon Pita nuru na ọ bu Onye-nwe-ayi, o b͕okwasi uwe uku ya (n'ihi na ọ b͕ara ọtọ), we tubà onwe-ya nime oké osimiri.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ onye ahụ na-eso ụzọ ya Jisọs hụrụ nʼanya gwara Pita, “Ọ bụ Onyenwe anyị!” Ngwangwa Saimọn Pita nụrụ na “ọ bụ Onyenwe anyị,” ọ yiiri uwe ya (nʼihi na ọ gba ọtọ), wụba nʼime mmiri ahụ.