John 21:8 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ndị ozi ndị ọzọ nọgidere nꞌime ụgbọ ahụ dọpụta ụgbụ ahụ nke azụ juru nꞌime ya. Ila nọ ihe dị ka narị nzọ ụkwụ na ise site nꞌala ọnụ mmiri.
Igbo 2006
Ma ndi ọzọ ndi nēso uzọ Jisus biara n'ub͕ọ ntà ha (n'ihi na ha anọghi n'ebe di anya n'ala, kama ihe ra ka ọgu cubit iri), nādọ ihe ha ji eb͕u azù nke azù juru nime ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị ọzọ ndị na-eso ụzọ ya bịara nʼụgbọ mmiri nta ahụ, na-adọpụta ụgbụ ha nke azụ juru nʼime ya, nʼihi na ha nọ nso nʼala ihe dị ka narị nzọ ụkwụ na ise.