John 3:12 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ bụrụ na unu ekwereghị nꞌihe ndị a na-eme nꞌetiti mmadụ nꞌime ụwa, unu ga-esi aṅaa kwere ma ọ bụrụ na m agwa unu ihe banyere ihe dị nꞌeluigwe?
Igbo 2006
Ọ buru na agwaram unu ihe nke uwa, ma unu ekweghi, ùnu gēsi aṅa kwere, ma ọ buru na agwam unu ihe nke elu-igwe?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ekwuola m banyere ihe dị nʼụwa ma unu ekweghị ya, oleekwanụ otu unu ga-esi kwere, ma ọ bụrụ na mụ agwa unu banyere ihe ndị dị nʼeluigwe?