John 3:26 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi nke a ha bịakwutere Jọn sị ya, “Onye ozizi, lee onye ahụ i gosiri ndị mmadụ nꞌofe nke ọzọ nke osimiri Jọdan, onye ahụ ị gbara ama banyere, ọ nọ ugbu a na-eme ọtụtụ mmadụ baptizim. Igwe mmadụ na-esokwa ya ka o mee ha baptizim.”
Igbo 2006
Ha we biakute Jọn, si ya, Rabai, Onye gi na Ya nọ n'ofè Jọdan, Onye gi onwe-gi b͕aworo àmà nye Ya, le, Onye ahu nēme baptism, madu nile nābiakute kwa Ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha bịakwutere Jọn sị ya, “Onye ozizi, onye ahụ ị gbara ama banyere ya nọ nʼofe Jọdan na-eme baptizim, mmadụ niile na-agakwukwara ya.”