John 3:8 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Dị ka ifufe si efegharị nꞌebe ọ bụla ọ chọrọ, ị na-anụkwa ka ọ na-eme mkpọtụ, ma ị mataghị ebe o si bịa ma ọ bụ ebe ọ na-aga, nꞌụzọ dị otu a, i nweghị ike ịmata otu Mmụọ Nsọ si amụ mmadụ ọzọ.”
Igbo 2006
Ifufe nēfe ebe ọ nāchọ, i nānu kwa olu-ya, ma i mataghi ebe o si bia, na ebe ọ nāga: otú a ka onye ọ bula amuworo site na Mọ Nsọ di.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ifufe na-efe nʼebe ọbụla masịrị ya. I nwere ike nụ ụzụ ya ma ịmataghị ebe o si abịa maọbụ ebe ọ na-aga. Otu a ka ọ dịkwara onye ọbụla a mụrụ site na Mmụọ.”