John 4:14 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma mmiri nke m ga-enye onye ahụ ga-abụ isi iyi ebighị ebi nꞌime ya. Ọ ga na-asọgharị nꞌime ya ebighị ebi. Ọ ga-aghọkwa nꞌime ya ụzọ ndụ ebighị ebi.”
Igbo 2006
ma onye ọ bula nke gāṅu miri ahu nke Mu onwem gēnye ya, akpiri agaghi-akpọ ya nku ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi; kama miri ahu nke Mu onwem gēnye ya gāghọ nime ya isi-iyi miri nāsuputa ri nne rue ndu ebighi-ebi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma onye ọbụla ga-aṅụ mmiri ahụ m nyere ya, akpịrị agaghị akpọkwa ya nkụ ọzọ. Nʼeziokwu, mmiri ahụ m nyere ya ga-aghọrọ ya isi iyi nke na-asọpụtara ya ndụ ebighị ebi.”