John 4:15 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nwanyị ahụ rịọrọ Jisọs sị ya, “Onyenwe anyị, biko nye m mmiri a, ka akpịrị ghara ịkpọ m nkụ ọzọ. Ka m hapụkwa ịga ụzọ a dị anya ọzọ, nꞌihi ịdọrọ mmiri.”
Igbo 2006
Nwanyi ahu si Ya, Onye-nwe-ayi, nyem miri a, ka akpiri we ghara ikpọm nku, ka m'ghara kwa isi n'ogologo uzọ a nile bia ebe a isere miri.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ nwanyị ahụ sịrị ya, “Onyenwe anyị nye m mmiri a, ka akpịrị ghara ịkpọ m nkụ ọzọ, ka m gharakwa ịdị na-abịa ebe a ịdọrọ mmiri.”