John 4:20 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma kọwaara m, gịnị mere unu ndị Juu jiri sị na Jerusalem bụ nanị ebe e kwesịrị ịnọ kpọọ isi ala nye Chineke. Anyị ndị Sameria sị na ọ bụ nꞌebe a, nꞌugwu Gerazim, ebe nna anyị ha kpọrọ isi ala nye Chineke.”
Igbo 2006
Nna-ayi-hà nile kpọrọ isi ala nye Chineke n'ugwu a; ma unu onwe-unu si, na ebe madu aghaghi ikpọ isi ala nye Chineke di nime Jerusalem.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nna nna anyị ha fere ofufe nʼugwu a, ma unu na-ekwu nʼebe ndị mmadụ ga-eferịrị ofufe bụ naanị na Jerusalem.”