John 4:21 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Jisọs zara ya sị, “Nwanyị, gee ntị ka m gwa gị, oge na-abịa mgbe ọ naagaghị adị mkpa ebe anyị nọ kpọọ isi ala nye Chineke. Ma ọ bụ nꞌebe a ma ọ bụ na Jerusalem.
Igbo 2006
Jisus si ya, Nwanyi, kwerem, oge hour nābia, mb͕e unu nāgaghi-akpọ isi ala nye Nnam, ma ọ bu n'ugwu a, ma-ọbu na Jerusalem.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jisọs sịrị ya, “Nwanyị kwere okwu m, oge na-abịa mgbe ị na-agaghị akpọ isiala nye Nna, maọbụ nʼugwu a ma ọ bụkwanụ na Jerusalem.