John 4:22 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ihe dị mkpa abụghị ebe anyị nọ kpọọ isi ala nye Chineke. Kama ọ bụ otu anyị siri kpọọ isi ala. Anyị na-esite nꞌime obi anyị kpọọ isi ala? Anyị na-akpọ isi ala site nꞌinyeaka nke Mmụọ Nsọ? Chineke bụ mmụọ. Anyị apụkwaghị ịkpọ isi ala nye ya nꞌụzọ ziri ezi ma ọ bụghị site nꞌinyeaka ya. Nke a bụ ụdị ịkpọ isi ala Chineke chọrọ site nꞌaka anyị. Unu bụ ndị Sameria maara ntakịrị banyere nke a. Unu na-akpọ isi ala nꞌisi. Anyị ndị Juu maara ihe nile banyere ya nꞌihi na nzọpụta rutere ụwa site nꞌaka ndị Juu!”
Igbo 2006
Unu onwe-unu nākpọ isi ala nye ihe unu nāmatagh: ayi onwe-ayi nākpọ isi ala nye ihe ayi matara: n'ihi na nzọputa si n'etiti ndi-Ju puta.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Unu na-efe ihe unu na-amaghị ma anyị na-efe ihe anyị matara, nʼihi na nzọpụta sitere nʼaka ndị Juu.