John 4:27 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ọ na-ekwu okwu a, ndị na-eso ụzọ ya bịara. O juru ha anya ịhụ Jisọs ka ya na nwanyị a na-ekwurịta okwu. Ma ọ dịghị onye nꞌime ha jụrụ ya ihe mere o ji mee nke a ma ọ bụ ihe ha na-ekwu.
Igbo 2006
Mb͕e Ọ nēkwu nka ndi nēso uzọ-Ya biara; o we ju ha anya na Ya na nwanyi nēkwurita okwu: otú ọ di, o nweghi onye ọ bula siri, Gini ka I nāchọ? ma-ọbu, Gini mere Gi na ya nēkwurita okwu?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼoge ahụ ndị na-eso ụzọ ya lọghachitara. Ọ gbagwojukwara ha anya nke ukwuu ịhụ na ya na nwanyị na-ekwurịta okwu. Ma o nweghị onye nʼime ha jụrụ nwanyị ahụ sị, “Gịnị ka ị chọrọ?” ma ọ bụkwanụ, “Gịnị kpatara gị na ya ji na-ekwurịta okwu?”