John 4:45 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe Jisọs bịaruru ala Galili, ndị obodo ahụ weere obi ha nile nabata ya. Nꞌihi na ọtụtụ nꞌime ha nọ na Jerusalem nꞌụbọchị mmemme Ngabiga ahụ hụ ụfọdụ ihe ịrịba ama Jisọs rụrụ.
Igbo 2006
Ya mere mb͕e Ọ biara na Galili, ndi Galili nara Ya nke-ọma, ebe ha hururi ka ihe O mere na Jerusalem ra n'ememe: n'ihi na ha onwe-ha je-kwa-ra ememe ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọ bịaruru Galili, ndị Galili nabatara ya ebe ha onwe ha gara mmemme na Jerusalem, ma hụkwa ọtụtụ ọrụ ebube ọ rụrụ nʼoge mmemme ahụ.