John 4:46 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma mgbe Jisọs na-agagharị na Galili ọ bịaruru Kena. Nke a bụ obodo ahụ ebe o mere mmiri ka ọ ghọọ mmanya. Mgbe ọ nọ nꞌebe ahụ, otu onye na-arụ ọrụ eze, nke bi nꞌobodo Kapanọm, nke nwere nwa nwoke ahụ na-esighị ike,
Igbo 2006
Ya mere Ọ biaruru Kena nke Galili ozọ, ebe O mere miri ka ọ ghọ manya-vine, Ma otù nwoke nke nējere eze ozi di, nke aru nādighi nwa-ya nwoke ike na Kapanaum.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọzọkwa, ọ bịaruru Kena nke Galili bụ ebe ahụ o mere mmiri ka ọ ghọọ mmanya. E nwekwara otu onye na-arụ ọrụ nʼụlọeze nọ nʼebe ahụ, nke ahụ na-adịghị nwa ya nwoke ike na Kapanọm.