John 4:50 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ahụ Jisọs gwara ya sị, “Laa nꞌụlọ gị. A gwọọla nwa gị!” Nwoke ahụ kweere nꞌihe Jisọs kwuru. Ọ hapụrụ ebe ahụ laa nꞌụlọ ya.
Igbo 2006
Jisus si ya, Ga nke gi; nwa-gi nwoke di ndu. Nwoke ahu kwere okwu Jisus gwara ya, o we ga nke ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jisọs sịrị ya, “Laa, nwa gị nwoke ga-adị ndụ.” Nwoke ahụ kweere nʼihe Jisọs kwuru laa.