John 4:9 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
O juru nwanyị ahụ anya na onye Juu ga-arịọ onye Sameria e ledara anya, ihe ọ bụla. Nke a bụ ihe a na-emetụbeghị mbụ. Ọ bụladị ekele ọnụ, ha adịghị ekelerịta onwe ha. Nwanyị a mere ka Jisọs mata nke a.
Igbo 2006
Ya mere nwanyi Sameria ahu si Ya, Gì onwe-gi si aṅa ariọ miri n'akam ka I ṅua, ebe I bu Onye-Ju, ma mu bu nwanyi Sameria? (N'ihi na ndi-Ju na ndi Sameria adighi-emekọ ihe.)
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nwanyị ahụ sịrị ya, “Olee otu gị bụ onye Juu si arịọ m bụ nwanyị Sameria mmiri ka ị ṅụọ?” (Nʼihi na ndị Juu na ndị Sameria anaghị emekọrịta ihe ọbụla.)