John 5:19 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Jisọs gwara ha sị, “Ọkpara apụghị ime ihe ọ bụla site nꞌike nke aka ya. Ọ na-arụ ihe ọ bụla ọ hụrụ Nna ya na-arụ. Ihe ọ bụla Nna mere nke a ka Ọkpara Nna na-emekwa.
Igbo 2006
Ya mere Jisus zara, si ha, N'ezie, n'ezie asim unu, Ọkpara apughi ime ihe ọ bula n'Onwe-ya, ma-ọbughi ihe Ọ huru na Nna-Ya nēme: n'ihi na ihe ọ bula Ya onwe-ya nēme, ndia ka Ọkpara-Ya nēme kwa otú ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jisọs zara ha sị, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, o nweghị ihe ọbụla Ọkpara pụrụ ime nʼonwe ya; naanị ihe o nwere ike ime bụ ihe ọ hụrụ Nna ya na-eme, nʼihi na ihe ọbụla Nna ahụ na-eme ka Ọkpara ya na-emekwa.