John 5:20 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi na Nna hụrụ Ọkpara ya nꞌanya, ọ naegosikwa ya ihe nile ọ na-eme. Ọkpara Nna ga-emekwa ihe ịrịba ama dị iche iche karịa ọgwụgwọ nwoke a, ka o ju unu anya.
Igbo 2006
N'ihi na Nnam nāhu Ọkpara-Ya n'anya, nēgosi kwa Ya ihe nile Ya onwe-ya nēme: oké ọlu kari ndia ka Ọ gēgosi kwa Ya, ka o we ju unu onwe-unu anya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na Nna ahụ hụrụ Ọkpara ya nʼanya ma na-egosikwa ya ihe niile ọ na-eme. Nʼezie ọ ga-agbagwoju unu anya nʼihi na ọ ga-egosi ya ihe karịrị ndị a.