John 5:3 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Igwe ndị ọrịa dina nꞌakụkụ ọdọ mmiri a. Ụfọdụ nꞌime ha bụ ndị ngwụrọ. Ụfọdụ bụ ndị isi. Ndị ọzọ bụ ndị akụkụ ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ. Ha nile nọ na-eche ka mmiri ahụ mee mkpọtụ.
Igbo 2006
Nime ndia ka ìgwè madu ndi aru-ha nādighi ike nēdina, ndi-ìsì, ndi-ngwurọ ndi akuku-aru-ha kpọnwuru akpọnwu, [nēche uṅarà nke miri ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼime ya ka igwe ndị ahụ na-esighị ike na-edina; ndị ìsì, ndị ngwụrọ, na ndị akụkụ ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ, ha na-eche mgbe mmiri ahụ ga-enugharị.