John 5:30 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mụ onwe m adịghị ekpe ikpe dị ka m si chọọ. Ana m ekpe ikpe dị ka Nna si chọọ. Ikpe m na-ekpe ziri ezi. Mkpa m abụghị ime ihe m chọrọ. Ana m achọ ime uche Nna m, onye zitere m.
Igbo 2006
Mu onwem apughi ime ihe ọ bula n'Onwem: dika M'nānu M'nēkpe: ikpem zi-kwa-ra ezi; n'ihi na etughi m ihe Mu onwem nāchọ, kama ihe Onye ziterem nāchọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Enweghị m ike ime ihe ọbụla nʼonwe m, ikpe m na-ekpe bụ naanị dị ka m nụrụ, ikpe m bụkwa nke ziri ezi, nʼihi na anaghị m eme ihe ga-amasị m, kama ọ bụ ihe ga-amasị onye ahụ zitere m.