John 5:36 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma enwere m ama karịrị ama Jọn. Ọrụ ebube nile m rụrụ gosiri na ọ bụ Nna m zitere m. Ha bụ ọrụ nke Nna m nyefere m nꞌaka ịrụ.
Igbo 2006
Ma àmà nke Mu onwem ji ka nke Jọn uku: n'ihi na ọlu nke Nnam nyeworom ka M'luzue ha, ọlu ahu onwe-ha nke M'nālu, nāb͕aram àmà, na Nnam ziteworom.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ma e nwere m ama dị ukwuu karịa nke Jọn, nʼihi na ọrụ ahụ ya bụ Nna nyere m ka m rụchapụ, bụkwa nke m na-arụ, na-agbara m ama na ọ bụ Nna ahụ zitere m.