John 5:4 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi na mmụọ ozi Onyenwe anyị na-abịa na mmiri ahụ gbarụọ ya. Mgbe mmiri a gbarụrụ, onye ọrịa ọ bụla buru ụzọ baa nꞌime ya ka a na-eme ka ahụ dị mma.
Igbo 2006
N'ihi na mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi nāridata n'ọdọ-miri ntà ahu n'oge ufọdu, we kpasue miri ahu: ya mere onye buru uzọ ba nime ya mb͕e akpasusiri miri ahu, eme ka aru di ya nma, n'ọria ọ bula jidere ya.]
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na mmụọ ozi Onyenwe anyị na-agbadata site na mgbe ruo na mgbe gbarụọ mmiri ahụ. Onye ọrịa ọbụla buru ụzọ daba nʼime mmiri ahụ ma a gbarụọ ya, ka a na-agwọ ihe ọbụla bụ ọrịa ya.