John 5:7 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Onye ọrịa ahụ zara sị, “Ahụ enweghị ike ịdị m mma, nꞌihi na mgbe ọ bụla mmiri a mere mkpatọ enweghị m onye ọ bụla ga-ekuba m nꞌime ya. Ọ bụrụ na m achọọ ịbanye, onye ọzọ ga-esi nꞌazụ m kwatuo m, buru m ụzọ banye.”
Igbo 2006
Onye ahu aru nādighi ike zara Ya, si, Onye-nwe-ayi, enweghm madu, ka ọ tubàm n'ọdọ-miri ntà nka, mb͕e ọ bula akpasuru miri: ma mb͕e mu onwem nọ nābia, onye ọzọ eburum uzọ rida.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onye ọrịa ahụ zara, “Nna m ukwu, enweghị m onye ọbụla ga-enyere m aka kuba m nʼime ọdọ mmiri a ma a gbarụọ ya, mgbe o bụla m chọrọ ka m danye, onye ọzọ na-eburu m ụzọ danye.”