John 6:15 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma Jisọs matara ihe ha chọrọ ime. Ọ maara na ha chọrọ ijide ya mee ya eze ha nꞌike. Ọ hapụrụ ha gamie nꞌelu ugwu ahụ nanị ya.
Igbo 2006
Ya mere mb͕e Jisus huru na ha gaje ibia idọkpuru Ya n'ike, ka ha we me Ya eze, O wezugara Onwe-ya ọzọ n'ugwu nání Ya onwe-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe Jisọs matara na ha chọrọ ịbịa dọkpụrụ ya nʼike chie ya eze, ọ hapụrụ ha ga nʼugwu naanị ya, nʼonwe ya.