John 6:17 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
ebe ha banyere nꞌụgbọ mmiri malite ịga nꞌọbodo Kapanọm, nke dị nꞌofe ọzọ nke osimiri Jọdan. Nꞌoge a ọchịchịrị ebidola ịgba, ma Jisọs alọghachikwutebeghị ha.
Igbo 2006
ha we ba n'ub͕ọ, we nāgabiga ofè oké osimiri ọzọ iga ru Kapanaum. Ọchichiri ab͕awo-kwa-ri ub͕u a, Jisus akābiakuteghi kwa ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
ebe ha banyere nʼotu ụgbọ mmiri, malite ịgabiga osimiri gawa nʼofe Kapanọm. Nʼoge a ọchịchịrị agbaala ma Jisọs alọghachikwutebeghị ha.