John 6:22 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌụtụtụ echi ya, igwe mmadụ zukọtara nꞌakụkụ mmiri ahụ Jisọs nọ nye ha nri. Ha chere na ha ga-ahụ Jisọs, nꞌihi na o soghị ndị na-eso ụzọ ya baa nꞌụgbọ mgbe ha bara nꞌụgbọ mmiri ụnyaahụ.
Igbo 2006
N'echi-ya, ìgwè madu ndi guzoro n'ofè ọzọ nke oké osimiri ahu huru na ub͕ọ ntà ọzọ adighi n'ebe ahu, ma-ọbughi otù, hu kwa na Jisus esoghi ndi nēso uzọ-Ya ba n'ub͕ọ-ha, kama na nání ndi nēso uzọ-Ya jere;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼechi ya, igwe mmadụ ahụ nọdụrụ nʼofe ọzọ nke ọnụ mmiri ahụ chọpụtara na ọ bụ naanị otu ụgbọ mmiri nta bịara nʼebe ahụ, na Jisọs esoghị ndị na-eso ụzọ ya banye nʼime ya, kama na ọ bụ naanị ndị na-eso ụzọ ya ka ụgbọ mmiri ahụ buuru pụọ.