John 6:24 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma mgbe ndị a na-ahụghị Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya, ha banyere ụgbọ mmiri ọzọ kwọfee osimiri ahụ na-aga Kapanọm ịchọ Jisọs.
Igbo 2006
ya mere mb͕e ìgwè madu ahu huru na Jisus anọghi n'ebe ahu, na ndi nēso uzọ-Ya anọghi kwa, ha onwe-ha bàra n'ub͕ọ ntà, we bia Kapanaum, nāchọ Jisus.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma mgbe igwe mmadụ ahụ ghọtara na Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya anọghị nʼebe ahụ, ha banyere nʼụgbọ mmiri nta ndị ahụ kwọfee gawa Kapanọm ịchọ Jisọs.