John 6:35 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Jisọs zaghachiri ha sị, “Abụ m nri na-enye ndụ. Onye ọ bụla na-abịakwute m agụụ agaghị agụkwa ya ọzọ. Akpịrị agaghị akpọkwa ndị nile kweere na m nkụ.
Igbo 2006
Jisus siri ha, Mu onwem bu nri nēnye ndu: onye nābiakutem, agu agaghi-agu ya ma-ọli, onye nēkwere kwa na Mu akpiri agaghi-akpọ ya nku ma-ọli mb͕e ọ bula.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jisọs sịrị ha, “Abụ m achịcha ahụ na-enye ndụ. Onye ọbụla na-abịakwute m, agụụ agaghị agụ ya. Onye ọbụla kwa kweere na m, akpịrị agaghị akpọ ya nkụ.