John 6:40 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi na nke a bụ uche Chineke. Onye ọ bụla hụrụ Ọkpara ya, kwerekwa na ya, ga-enwe ndụ ebighị ebi. Aga m eme ka o site nꞌọnwụ bilite nꞌụbọchị ikpeazụ ahụ!”
Igbo 2006
N'ihi na nka bu ihe Nnam nāchọ, ka onye ọ bula nke nēle Ọkpara-Ya anya, nke nēkwere kwa na Ya, we nwe ndu ebighi-ebi; Mu onwem gēme kwa ka o si n'ọnwu bilie n'ubọchi ikpe-azu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nke a bụ uche nke Nna m, na onye ọbụla lere Ọkpara ahụ anya, kwerekwa na ya ga-enweta ndụ ebighị ebi, m ga-emekwa ka o bilie nʼụbọchị ikpeazụ.”