John 6:45 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
E dere ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, ‘A ga-akụziri mmadụ nile ihe banyere Chineke.’ Onye ọ bụla Chineke gwara okwu, nke mụtakwara eziokwu ahụ site nꞌaka Chineke ga-abịakwute m.
Igbo 2006
Edewo ya n'akwukwọ ndi-amuma, si, Ha nile gābu kwa ndi Chineke zíworo ihe. Onye ọ bula nke nuworo site n'ọnu Nnam, nke mutawo-kwa-ra ihe, ọ nābiakutem.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
E dere ya nʼakwụkwọ ndị amụma, ‘Ha niile ga-abụ ndị Chineke ga-akụziri ihe.’ Onye ọbụla nke gere Nna ahụ ntị ma mụtakwa ihe site na ya na-abịakwute m.