John 6:5 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe Jisọs leliri anya ya elu hụ igwe mmadụ dị ukwuu na-abịakwute ya ọ jụrụ Filip ajụjụ sị, “Ebee ka anyị ga-azụta nri ga-ezu ndị a?”
Igbo 2006
Ya mere Jisus, mb͕e O weliri anya-Ya elu, hu na oké ìgwè madu nābiakute Ya, Ọ si Filip, Òle ebe ayi gāzuta ob͕e achicha, ka ndia we rie ihe?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe Jisọs leliri anya elu hụ oke igwe mmadụ na-abịakwute ya, ọ sịrị Filip, “Olee ebe anyị ga-azụta achịcha ndị a ga-ata?”